Psalms 9

Abụ Ọma. Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nʼusoro olu abụ “Ọnwụ nke Ọkpara.” Abụ ọma Devid.

Ekele nʼihi nnapụta Chineke

1O Onyenwe anyị, aga m esite nʼala ala obi m too gị,
aga m agwakwa onye ọbụla ihe ọma niile ị na-eme.
2Obi ga-atọ m ụtọ; obi m ga-ejupụta nʼọṅụ nʼihi gị,
aga m abụrụ gị abụ otuto, gị Onye kachasị ihe niile elu.

3Ndị iro m na-alaghachi azụ,
ha na-asọ ngọngọ na-alakwa nʼiyi nʼihu gị.
4I kpeela ikpe m nʼụzọ ziri ezi,
nʼocheeze gị ka ị nọdụrụ na-ekpe ikpe ziri ezi.
5I baarala mba niile mba ma laa ndị ajọ omume nʼiyi,
hichapụkwa aha ha ruo mgbe ebighị ebi.
6Mbibi nke na-enweghị ọgwụgwụ adakwasịla ndị iro m,
I hopukwala obodo ha niile.
Ọ dịghị onye na-echetakwa ha ọzọ.

7 Onyenwe anyị bụ eze ruo mgbe ebighị ebi.
Ọ kwadoola ocheeze ya maka ikpe ikpe ziri ezi.
8Ọ ga-eji ezi omume kpee mba niile ikpe;
jirikwa ikpe ziri ezi chịa mba niile.
9 Onyenwe anyị bụ ebe mgbaba nye ndị niile a na-emegbu emegbu.
Ọ bụụrụ ha ebe mgbaba e wusiri ike nʼoge nsogbu.
10 Onyenwe anyị, ndị niile maara aha gị ga-atụkwasị gị obi,
nʼihi na ọ dịghị mgbe ị na-agbakụta ndị niile na-atụkwasị gị obi azụ.

11Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ otuto, bụ onye nọ nʼocheeze ya na Zayọn.
Kwusaaranụ mba niile ihe banyere ọrụ ebube ya.
12Nʼihi na onye ahụ na-abọrọ ndị e gburu egbu ọbọ anaghị echefu ihe;
ọ dịghị elefu mkpu akwa nke ndị a na-akpagbu anya.

13O Onyenwe anyị, lee ka ndị iro m si akpagbu m!
Meere m ebere ma napụta m site nʼọnụ ọnwụ,
14ka m nwee ike ikwusa banyere otuto gị
nʼọnụ ụzọ ama
Ọ bụ nʼụzọ ama obodo ka a na-anọ akparị ụka niile dị mkpa. Rut 4:1
niile nke ada Zayọn,
nọrọkwa ebe ahụ ṅụrịa ọṅụ nʼime nzọpụta gị.

15Ndị mba niile adabala nʼime olulu ahụ ha gwuru;
ọnya ahụ ha siri, zoo, amaala ha.
16Ihe e ji mara Onyenwe anyị bụ ikpe ya ziri ezi;
ọrụ aka ndị na-emebi iwu na-ama ha dịka ọnya. Sela
17Ndị niile na-eme ajọ omume na-alaghachi nʼili;
nke a bụkwa ọnọdụ mba niile na-echefu Chineke.
18Ma ọ bụghị ruo mgbe ebighị ebi ka a ga-echefu ndị nọ na mkpa;
olileanya ndị a na-akpagbu agaghị abụkwa nke efu.

19O Onyenwe anyị, bilie! Ekwela ka mmadụ nwee mmeri ọbụla nʼebe ị nọ;
ka e kpee mba niile ikpe nʼihu gị.
20O Onyenwe anyị! Mee ka ha maa jijiji nʼoke egwu;
mee ka mba niile ghọta na ha bụ naanị mmadụ. Sela
Copyright information for IboBIU